Abụ Ọma 121 - Igbo 2020

← Books

Abụ Ọma

Igbo 2020
| 8 of 8 verses

1 Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile, olee ebe inyeaka ga-esi bịara m?

2 Inyeaka m na-esite nʼaka Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa bịa.

3 Ọ gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ, onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile;

4 nʼezie onye na-eche Izrel nche adịghị arahụ ụra, ọ dịghị atụkwa oru ụra.

5 Onyenwe anyị na-eche gị nche, Onyenwe anyị bụ ndo gị nʼaka nri gị;

6 anyanwụ agaghị achagbu gị nʼehihie, ọnwa agaghị etigbukwa gị nʼabalị.

7 Onyenwe anyị ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịdakwasị gị. Ọ ga na-eche ndụ gị nche mgbe niile.

8 Onyenwe anyị ga-echebe gị mgbe ị na-apụ na mgbe ị na-abata abata, site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi.