Abụ Ọma 129 - Igbo 2020

← Books

Abụ Ọma

Igbo 2020
| 8 of 8 verses

1 Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge, ka Izrel kwuo.

2 “Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge, ma ha enweghị ike merie m.

3 Ndị ikom na-akọ ubi akọgharịala azụ m dịka ala ubi, mee ebe ha kọrọ akọ ka ọ dị ogologo.

4 Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume; ọ tọpụla m site nʼagbụ niile nke ndị ajọ omume.”

5 Ka ndị niile kpọrọ Zayọn asị bụrụ ndị ga-alaghachi azụ nʼihere.

6 Ka ha niile dịrị ka ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ nke na-akpọnwụ tupu o pupụta;

7 nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị eji ha kpojuo aka ya abụọ, maọbụ onye mkpokọta e nwee ike kpojuo aka ya.

8 Ka ndị si nʼụzọ na-agafe hapụ ị sị ha, “Ngọzị Onyenwe anyị dịrị unu. Anyị na-agọzi unu nʼaha Onyenwe anyị.”