Abụ Ọma 148 - Igbo 2020

← Books

Abụ Ọma

Igbo 2020
| 14 of 14 verses

1 Toonu Onyenwe anyị. Toonu Onyenwe anyị site nʼeluigwe, toonu ya nʼebe niile kachasị elu.

2 Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile, toonu ya, unu usuu ndị agha ya niile.

3 Toonu ya, anyanwụ na ọnwa toonu ya, kpakpando niile.

4 Toonu ya, unu eluigwe kachasị elu na unu mmiri dị nʼelu mbara eluigwe.

5 Ka ha niile too aha Onyenwe anyị, nʼihi na ha niile malitere ịdị site nʼokwu ọnụ ya.

6 O doro ha nʼọnọdụ ha ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi; o nyere iwu nke a na-agaghị agabiga.

7 Toonu Onyenwe anyị, site nʼụwa, unu oke anụ mmiri niile na ogbu mmiri niile,

8 na amụma, na mkpụrụ mmiri, na snoo na igwe ojii niile, na oke ifufe niile na-eme ihe o nyere nʼiwu,

9 unu ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile na-amị mkpụrụ na osisi sida niile

10 na anụ ọhịa, na anụ ụlọ niile, na ihe niile na-akpụ akpụ nʼala na nnụnụ niile,

11 ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche, unu ụmụ eze na ndị niile na-achị achị nʼụwa,

12 ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ, ndị okenye na ụmụntakịrị.

13 Ka ha niile too aha Onyenwe anyị, nʼihi na ọ bụ naanị aha ya ka e buliri elu; ebube ya dị ukwuu karịa eluigwe na ụwa.

14 O meela ka mpi ndị ya dị elu, otuto ndị nsọ ya niile, nke Izrel ndị ọ hụrụ nʼanya. Toonu Onyenwe anyị.